Pascal Ibe dere nyocha a
Ihe Ekwuru
Ọtụtụ ndị nọ na Facebook kwuru na ndị omebe iwu Nigeria akwadola ikeputa steeti ọhụrụ dị iri na abụọ n’ofe mpaghara isii nke mba ahụ.
Ihe Anyị Chọpụtara
Ihe a-ekwru bụ Ụgha. Ndị omebe iwu Nigeria nwetara naanị atụmatụ ọhụrụ maka imepụta steeti iri atọ na otu na ọchịchị ime obodo iri na asatọ, ma yibekwa naanị kọmitii iji mee nlegharị anya n’ihu ọha na nleba anya n’iwu obodo.
Akụkọ N’Uju
Kemgbe afọ 2025, oku a na-akpọ maka imepụta steeti ọhụrụ na Nigeria na-ada ụda, n’agbanyeghị na ọtụtụ ụmụ amaala chere na nke a abụghị ihe kacha mkpa obodo ahụ ugbu a.
Banyere nke a, ọtụtụ ndị nọ Facebook ekwuola na ndị omebe iwu Nigeria akwadola ikeputa steeti ọhụrụ iri na abụọ n’ofe mpaghara isii nke mba ahụ.
Crusader Radio, IgbereTV so na ndị Facebook bipụtara nkwupụta a na 18 July 2025.
Ha kwuru, “Na ndị omebe iwu Nigeria akwadola imepụta steeti ọhụrụ iri na abụọ n’ofe mpaghara isii nke mba ahụ .n’usoro omebe iwu iji kwalite nnochite anya, na ọchịchị ndị mepere emepe.
FACTWATCH Nigeria chọpụtara na ihe ndị nọ ná Facebook kwuru agbasala ngwa ngwa, ya mere anyị ji kpebie ịgba ọsọ nyocha ya.
Read This Fact Check In English Language here.
Nyochaa
Nke mbụ, FACTWATCH Nigeria chọpụtara na ụbọchị 18th July, mgbe ihe a ekwuru malitere ịgbasa n’ịntanetị, ndị ụlọ omebe iwu Nigeria nọ na 14th July kwuo na ha ga ala ezumike ruo ụbọchị 22nd July, maka iru uju ọnwụ onyebubu onyeisiala Nigeria n’oge gara, bụ Muhammadu Buhari, onye nwụrụ ụbọchị ụka n’ụlọọgwụ London. Nke a na-egosi na ụlọ omebe iwu Nigeria enwebeghị nnọkọ ọgbakọ kemgbe ụbọchị 14 July. Nke a na-egosikwa na ihe a ndị nọ Facebook kwuru abụghị eziokwu.
Anyị chọpụtakwara na ihe ekwuru enweghị nkọwa dị mkpa banyere ịkepụta steeti ọhụrụ na Nigeria, dịka aha onye wepụtara akwụkwọ akụkọ sitere na Sineti, yana ụbọchị e wepụtara ya. Anyị chọpụtara na ọ nweghị ihe dị ka kọmitii na-emepụta steeti dị ka ekwuru na nkwupụta ahụ. Kama, kọmitii na-enyocha iwu nke na-ahụ maka usoro okike steeti ọhụrụ na Nigeria.
Nchọgharị ọzọ mere ka anyị gaa na akụkọ edere na 4th July, nke kọrọ na ndị ụlọ omebe iwu Sineti natara naanị atụmatụ ọhụrụ maka ịkepụta steeti ọhụrụ dị iri atọ na yana ịmepụta mpaghara.
Dị ka Premium Times si kwuo, Senate Committee on Constitution Review (CRC) natara atụmatụ maka ịkepụta steeti ọhụrụ dị iri atọ na yana ịkepụta mpaghara ọchịchị.
Akụkọ ahụ kọwapụtara mmemme kọmitii ahụ n’ihu nnọkọ ọha na eze ebe aga anọ nyocha iwu Nigeria, nke ekwesịrị ime site na 4th na 5th July.
Agbanyeghị nke a, onwebeghi ihe ndị ụlọ omebe iwu Sineti Nigeria kwụrụ banyere usoro iweputa steeti ọhụrụ na Nigeria, ka ọ dị ugbua.
Ọzọkwa, na 2nd July, kọmitii nke Ụlọ Nnọchiteanya na nyocha nke iwu Nigeria kwuru na ha natara arịrịọ di iri anọ na isii maka ịkepụta steeti ọhụrụ.
Nke a abụghị nkè mbụ
Na February 2025, Kọmitii ndị Nnọchiteanya tụrụ akọ ka ekepụta steeti ọhụrụ dị iri atọ na otu na Nigeria.
Ma ka izu ole na ole gasịrị, , osote onye isi okwu, Hon. Benjamin Kalu, kpughere na atụmatụ niile maka ịkepụta steeti ọhụrụ dị iri atọ dara iwu.
Nchịkọta
Ndị ụlọ omebe iwu Nigeria natara naanị atụmatụ maka ikepụta steeti ọhụrụ na mbido July, ma-nke a enwebeghị nkwado ọbula ka di ugbu a.