Ihe E Kwuru

Otu ihu Facebook ana-akpọ IgbereTV, kesara foto na-egosi mwakpo a wakporo obodo nke onye bụbu onye isi ndị agha Nigeria, bụ Buratai.

Ihe Anyị Chọpụtara

Foto a na-eduhie eduhie. Nchoputa gosiri na foto a sitere na Maachị 2023 mgbe Operation Hadin Kai na mmekorita ya na Civilian Joint Task Force (CJTF) wakporo ebe nzuzo nke ISWAP na mpaghara Dikwa Local Government nke Borno State, gbuo mmadụ irí anọ n’ime ndị na-eyi ọha egwu gụnyere ọchịagha, Abu Zahra.

Akụkọ N’Uju

Otu ihu Facebook ana-akpọ IgbereTV, kesara foto na-egosi mwakpo a wakporo obodo nke onye bụbu onye isi ndị agha Nigeria bụ Tukur Buratai.

Ọtụtụ ndị mmadụ nọ Facebook kwenyere na foto a gosipụtara mwakpo ahụ bụ eziokwu.

Buratai bụ onye agha Nigeria lara ezumike nka bụ onye isi ndị agha Nigeria, onye bụbu onye isi ndị agha, nke President Muhammadu Buhari họpụtara na 2015, na onye nnọchi anya Nigeria na Republic of Benin.

Read This Fact Check In English Here

Nyochaa

Mgbe FACTWATCH Nigeria chọrọ foto a na Google, anyị chọpụta na foto a sitere na Machị 2023 mgbe ndi agha Nigeria ana-kpo Operation Hadin Kai na mmekorita ya na Civilian Joint Task Force (CJTF) wakporo ebe nzuzo nke ndị ISWAP dị na Dikwa Local Government Area nke Borno State, wee gbuo mmadụ iri anọ n’ime ndị na-eyi ọha egwu gụnyere ọchịagha, Abu Zahra.

Dị ka ụlọ ọrụ mgbasa ozi ama ama si kwuo, Zagazola Wakama kọrọ na ndị agha ahụ kpochapụrụ ndị na-eyi ọha egwu na-nchịkọta site na aka Maj. Gen. Shaibu Waidi, General Officer Commanding 7 Division na Commander Sector 1, na Mukdolo, GUPDILO obodo, dị n’etiti Dikwa, Ngala na Mafa na steeti Borno.

Lee akụkọ ndị yiri nke a ebe a na ebe a.

N’aka nke ọzọ, ndị agha Nigeria kwụsịrị mbọ ndị Boko Haram gbara ka ha wakpo obodo Buratai na obodo ọzọ dị na steeti Borno n’ime izuka ole na ole gara aga.

Vanguard kọrọ na ndị agha ala na Air Component nke North East ‘Operation HADIN KAI’ (OPHK), kpochapụrụ
ọtụtụ ndị na-eyi ọha egwu, ma nwetaghachi ngwa ọgụ dị iche iche na ngwa agha nke Boko Haram, na mbuso agha megidere ndị agha na Buratai, n’okpuru ọchịchị Biu, na Mallam Fatori, okpuru ọchịchị Abadam nke steeti Borno.

Mwakpo a nke bụrugoro ihe efu n’obodo Buratai, mere n’isi ụtụtụ Thursday, 5 June 2025, mgbe ndị na-eyi ọha egwu chọrọ iji aghụghọ bata ebe ndị agha Nigeria nọ site na ụzọ niile.

Gụọ akụkọ a yiri nke a ebe a na ebe a.

Nchịkọta

IgbereTV wechighatara foto ochie a iji gosi mwakpo ndị Boko Haram mere nso nso a n’obodo onye bụbu onye isi ndị agha Nigeria bụ Buratai