Pascal Ibe dere nyocha a
Ihe E Kwuru
Dị ka nhọputa izugbe nke afọ 2027 na Nigeria na abịa nso, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche na akwado na ụzọ ọbula ha nwere ike iji inweta mmeri.
Otu onye nọ mgbasa ozi nke X, aha ya bụ @origunalprofile (Maazi Tunde Ednut), kwuru na ndị ọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) wakporo ụlọ Theodore Orji, gọvanọ chiri Steeti Abịa na oge gara aga.
Gọvanọ Orji chịrị Steeti Abia site n’afọ 2007 ruo n’ọnwa May nke afọ 2015.
N’akụkụ aka nke ọzọ, EFCC bụ ụlọ ọrụ na-ahụ maka iwu na mgbochi mpụ na Nigeria nke na-enyocha mpụ ego dịka aghụghọ na ịbupu ego n’ụzo ohi.
Di ka onye a nọ na X siri kwuo, ndị EFCC butere nnukwu oge karịrị otu naira trilịọn, nnukwu ọlaedo ya na ụgbọala dị iche iche n’ụlọ Orji.
@originalprofile gakwaa n’ihu wee lwuo na ihe kpatara ndị ọrụ EFCC jírí wakpo ụlọ Orji bụ na ọjụrụ iza ọtụtụ òkù ndị EFCC kpọrọ ya, na ọtụtụ ọnwa gara aga.
Onye a nọ na X tinyekwara foto atọ amakọrọ ọnụ nke gosiri nnukwu oge, ọla edo na ụgbọala ndị EFCC butere ụlọ Orji.
FACTWATCH Nigeria hụrụ na onye ọzọ nọ na X, bụ @heritagenewsnet, Eastern Heritage News , kwukwara otu ihe ahụ @originalprofile kwuru banyere aka chiri Steeti Abịa, bu Theodore Orji.
Ihe a mmadụ abụọ a nọ na X kwuru nwetere okwu nzaghachi dị iche iche site na ọtụtụ ndị mmadụ nọ na X.
Gụọ ihe a ndị a kwuru na asụsụ bekee na ebe a na ebe a
Nyocha
Na mbụ, FACTWATCH Nigeria tinyere foto atọ amakọrọ ọnụ ndị ahụ na egosi nnukwu oge, ọlaedo na ụgbọala dị iche iche ndị EFCC butere n’ụlọ Orji, na Google Lens, wee chọpụta na foto ndia ahụ enweghị njikọ ọbula gosiputara na ha sitere na mwakpo ndị EFCC wakporo ụlọ Orji.

Ọmụmaatụ, anyị chọpụtara na foto nke mbụ na egosi nnukwu oge dollar esighi na ụlọ Orji, kama osi foto dị iche iche gara nke sitere mba United States of America.
Ebe foto nke abụọ gosiri na ụgbọala dị iche iche ahụ sitere na akụkụ nke ndị TheGuardianNigeria bipụtara na afọ 2019, nke gosiri na foto ahụ bu maka otụtụ puku ụgbọala e jidere nke ga-eri ihe dị ka ijeri naira iri atọ (N30 billion) nọ na nke ndị Nigeria Customs Service (NCS) di ka ndị na-achọ ohere ịzụta ha na ikpo okwu e-auction na oge ahụ.
Foto nke ikpeazụ na egosi nnukwu ọlaedo sitere mgbe onye na-arụ ọrụ plọmba kpara ọlaedo mgbe ọ hụrụ akụ̀ ruru ọtụtụ nde n’ime igbe e liri n’ala nke ndị ọrụ ndị ọzọ leghaara anya, dika akwụkwọ TheSun siri dee afọ 2024.
Onye ọrụ ahụ nwere ihu ọma wee hụrụ nnukwu mkpụrụ ego ọlaedo ruru nde £2 n’ime igbe ígwè dị n’okpuru ụlọ nchekwa dị na Vienna, Austria.
Ihe ọzọ anyị chọpụtara bu na onweghi mgbe ndi ọrụ EFCC jírí bipute n’ihu akwukwọ Facebook na ha wakporo ụlọ Theodore Orji, ma ọbu, kọwaapụta na ha achọ aka chiri steeti Abia achọ.
Ọzọ dị ka ibe ya bụ na enweghị ụlọ akụkọ mgbasa ozi ama ama na Nigeria, kwadoro na ihe ndị a nọ X kwuru bụ eziokwu.
Anyị leeleere anya n’ihu akwukwọ Facebook nke gọvanọ chiburu Abịa Steeti bụ Orji mana anyị abụghị ebe ọ kwupụtara na ndị EFCC wakporo ụlọ ya.
Ihe Anyị Chọpụtara
ỤGHA
Nyocha anyị mere gosiri na ihe ndị no na X kwuru bụ ụgha.


