Ihe E kwuru

Dị ka nchịkwa nke onye isi ala Nigeria bụ Bola Tinubu ruru nso na afọ abụọ, ọtụtụ ndị Nigeria akatọọ ya maka ịghara idozi ihe dị iche iche di mkpa na obodo a.

Site na ngalaba nke akụ na ụba na nchekwa na ịkwado ọchịchị onye kwuo uche ya, ọtụtụ ndị Nigeria kwubiri na ọ nweghị ihe pụrụ iche ga-esite na nchịkwa a aputa, dika ọfọrọ afọ abụọ ka ọchịchị ya gwụ.

Banyere nke a, ụfọdụ ndị Nigeria nọ na ngalaba mgbasa ozi X, bipụtara vidiyo na-egosi ebe Fox News nyochara ọchịchị onyeisiala Nigeria bu Bola Tinubu.

Fox News bụ akụkọ mgbasa ozi nke mba America nwere Igwe onyonyo na weebụsaịtị nke dị na New York City, U.S.

N’ime otu nkeji vidiyo a, ọ na-egosiputa ọtụtụ ebe nchịkwa dị iche iche nke ọchịchị Tinubu na elebaghi anya n’ime ụbọchị naari asaa na abụọ dika onyeisiala Nigeria.

Onye nọ na X bu @mkadamu3, bipụtara vidiyo a, wee kwuo na Fox News nyochara ọchịchị nke onyeisiala Nigeria.

Ụfọdụ ndị mmadụ nọ na X kwuru na vidiyo abụghị eziokwu.

FACTWATCH Nigeria hụkwara na ekesala vidiyo a na WhatsApp na Facebook.

READ THIS FACT CHECK IN ENGLISH HERE

Nyochaa

Nke mbụ, mgbe FACTWATCH Nigeria chọrọ ihe a onye nọ na X kwuru na Google, anyị hụrụ na onye ọzọ aha ya bu @Ezekwesirlii, bu onye mbụ bipụtara vidyo a na 3rd May. Anyị chọpụtakwara na vidyo a gbasara na Facebook n’oge ahụ.

Nchọpụta miri emi nke FACTWATCH Nigeria mere gosipụtara na ebipụtara vidyo a na 29 April 2025, dika esiri kwuo na vidyo a na Tinubu anọrula ụbọchị naari asaa na abụọ dika onyeisiala Nigeria.

Mgbe anyị tinyere vidyo a na akọrọ ngwa teknoloji ana-kpo Hive Moderation, FACTWATCH Nigeria chọpụtara na ọ bụ AI (Artificial Intelligence) ka ejiri mepụta vidyo a.

Nke a gosiri na vidyo a abughi eziokwu.

Foto nke mbụ: Lee nyocha siri na Hive Moderation ebe a
Foto nke abụọ: Lee nyocha siri na Hive Moderation ebe a

Ọzọkwa, FACTWATCH Nigeria enweghị ike ịchọta vidiyo yiri nke a na weebụsaịtị Fox News.

Anyị ahụghikwa vidiyo a na peeji Facebook, YouTube Channel, ma ọ bụ na akaụntụ X nke dị Fox News.

Ihe Anyị Chọpụtara

Ihe onye nọ X kwụrụ si na Fox News nyochara ọchịchị nke onyeisiala Nigeria bụ Tinubu, bụ ỤGHA Nchọpụta egosila na eji AI mepụta vidiyo a.

FACTWATCH Nigeria enwéghị ike ahụ vidyo a na na peeji Facebook, YouTube Channel, ma ọ bụ na akaụntụ X nke dị Fox News.

READ THIS FACT CHECK IN ENGLISH HERE